Otú, Ahara àkà Igu Akwukwọ Abù Ọma.

Aganāgusi Akwukwọ Abù Ọma kwa-ọnwa, otú akara ya, ma n’Ekpere Ututu ma n’Ekpere Anyasi. Ma n’ọnwa February agāguru ya nání ri’ubòchi nke-orú-na-asatọ ma-ọbu nke-orú-na-iteghete n’ọnwa.

Ebe January, March, May, July, August, October, na December nwere n’otù n’otù orù ubọchi na iri na otù: Akara na agāgu otù Abù Ọma ahu n’ubọchi ikpe-azu n’ọnwa ndia nke aguru n’ubọchi nke-orù-na-iri: ka ewe malite ọzọ igu Akwukwọ Abù Ọma n’ubọchi mbu nke ọnwa ọzọ so ya.

Ọzọ, ebe ekere Abù Ọma 119 orú òkè na abua, ebe o to-kwa-ra ogologo nke-uku igu ya otù mbe; edoziri ya ka ewe ghara igu kari anọ ma-ọbu ise nime orú òkè na abua ahu n’otù mbe.

N’ikpe-azu Abu Ọma ọ bula, ma-ọbu n’ikpe-azu òkè ọ bula n’ Abù Ọma 119, ka agāgu Abù nka,

Otuto diri Nna, na Ọkpara: na Mọ Nsọ;

Otú ọ diri na mbu, ọ di ubu a, gādigide otú a: we rue n’uwa ebigh-ebi.

Amen.

 

FULL PRAYER